Isaiah 58

Ezi ibu ọnụ

1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu.
Welie olu gị dịka opi ike.
Opi ike bụ ihe e ji akpọkọta ndị agha nʼoge agha.

Gwa ndị m nnupu isi ha,
gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.
2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m
ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile,
dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi,
ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ.
Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi,
na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso.
3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ,
ma ị dịghị ahụta ya?
Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala,
ma ị dịghị ahụta nke a?’

“Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu,
unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.
4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ,
ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu.
Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa
na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu.
5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara,
naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala?
Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara,
nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ?
Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ,
ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara?

6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara:
Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi,
na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu,
na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha
na itiji yoku ọbụla?
7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị,
ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye.
Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe,
ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.
8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ.
A ga-agwọkwa ọrịa gị niile.
Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị,
ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.
9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa,
ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a.

“Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu,
ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,
10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri,
nyere ndị nọ na mkpa aka,
mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta,
ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.
11 Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile.
Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ,
meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike.
Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma,
dịka isi iyi na-adịghị ata ata.
12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile.
Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie.
A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada,
ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.

13“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,
sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m,
ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị
na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu,
ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị,
na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
14mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị,
m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ,
meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.”
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
Copyright information for IboBIU